Discover millions of ebooks, audiobooks, and so much more with a free trial

Only $11.99/month after trial. Cancel anytime.

IGBO DI NFE
IGBO DI NFE
IGBO DI NFE
Ebook232 pages1 hour

IGBO DI NFE

Rating: 0 out of 5 stars

()

Read preview

About this ebook

IGBO DI NFE ka mụ dere maka asụsụ-igbo. Ọga-enyere ndi-nkụzi aka ikụzi asụsụ anyi.


Nkpụrụ-okwu n'asụsụ-igbo bara-ụba nime ya. Aha di iche iche jupụtara nime ya. Ihe esere-ese di otụtụ nime ya. Ilụ-igbo na akụko di iche iche bara ụba nime akwụkwọ nkea.

LanguageIgbo
PublisherGotham Books
Release dateMar 1, 2024
ISBN9798887757360
IGBO DI NFE

Reviews for IGBO DI NFE

Rating: 0 out of 5 stars
0 ratings

0 ratings0 reviews

What did you think?

Tap to rate

Review must be at least 10 words

    Book preview

    IGBO DI NFE - Sunny Abakwue

    OKWU NDỤMỌDỤ:

    Asụsụ anyi mara mma nke ukwuu. Aha ya bụ asụsụ Igbo. N’ezie, asụsụ anyi di ka ọgbụgba-ndụ abụa nke akwụkwọ nsọ.

    Akwụkwọ-nsọ nwere ọgbụgba-ndụ ochie na ọgbụgba-ndụ ọhụụ. Ha abụa nwere ọlụ di iche iche nke diri ha. Ụfọdụ bụ ọlụ alụrụ na-mgbe ochie. Ndi ọzọ bụ ọlụ achọrọ ka-alụa n’oge ndia.

    N’ezie, asụsụ-Igbo nwere ọnọdụ di ka ọgbụgba-ndụ nke akwụkwọ-nsọ. Nke mbụ bụ asụsụ Igbo nke ndi mgbe-ochie sụrụ n’oge gara aga. Nke abụa bụ asụsụ na ọgụgụ na odide-Igbo, nke ndi ọgbụgba-ndụ ọhụụ na-asụ, na agụ, na-edekwa.

    Ọgbụgba-ndụ ọhụụ di n’asụsụ, n’odide na n’ọgụgụ-Igbo. Ihe ndia emewo ka okwu-Igbo bụrụ ihe amara aha ya n’ebe nile.

    Asụsụ-Igbo bụ asụsụ kwesiri ka ebulie ya elu. Ee, asụsụ Igbo mara mma. Onye-Okike gọziri ya. Nihi nkea, ibuli ya elu bụ ọlụ diri mụ na gi.

    ŅKPỤRỤ-OKWU N’ASỤSỤ IGBO:

    ŅKPỤRỤ-OKWU DI NTAKỊRỊ:

    ỤDA-UME NA-ASỤSỤ IGBO:

    Ụda-ume bụ mkpụrụ-okwu bara uru karisia. Ọna-eme ka mkpụrụ-okwu ndi-ọzọ bụrụzie okwu zuru oke.

    Ụda-ume ndia pụtara ihe n’asụsụ Igbo: A, E, I, İ, O Ọ U Ụ. Anyi nwere ụda-ume, n’asụsụ Igbo, karia nke ndi-ọcha nwere n’asụsụ bekee. Nani ụda-ume ise ka ndi ọcha nwere n’asụsụ ha. Ma, anyi nwere ụda- ume asatọ n’asụsụ Igbo.

    N’ezie, ụda-ume anyi mara mma karia nke ndi ọcha. Ha na-ejikọta nkpụrụ-okwu, meekwa ka okwu ahụ bụrụ ihe mmadụ ga-aghọta.

    MGBOCHI-UME N’ASỤSỤ ANYI:

    Mgbochi-ume di ọtụtụ karia ụda-ume. Ha di iri-abụọ-na-asatọ. Ha na ụda-ume bụ mkpụrụ-okwu.

    Mgbochi-ume pụtara ihe n’asụsụ Igbo. Ka anyi tulee ha n’otu n’otu. Ee, ka anyi nyochakwa ha di ka ha niile si di:

    MKPỤRỤ OKWU BARA URU KARỊA IBE YA:

    Ụda-ume bụ mkpụrụ-okwu. Ha bara uru karia mgbochi- ume. Ewepụ ha, okwu ahụ abụrụzie ihe efu, n’ezie.

    NJIKỌTA MKPỤRỤ-OKWU ABỤỌ:

    NJIKỌTA ŅKPỤRỤ-OKWU ATỌ:

    Baa, Bịa, Bie, Buo, Bụa, Bụọ, Bue.

    Dee, Die, Dua, Dụa.

    Fua, Fue, Fụọ, Fuo.

    Gaa, Gua.

    Ghaa, Ghua, Ghue, Ghọọ

    Hia, Hua, Hue, Hụa

    Jee, Jie, Jụa

    Kua, Kue, Kuọ, Kụọ

    Lua, Lụa, Lue, Lie, Lọọ, Laa.

    Mia, Mie, Mua, Mụa.

    Nua, Nọọ, Nnọ, Nna, Nne

    Ñụa, Ñụọ

    Pia, Pue, Pụa

    Rie, Rue, Rụa

    Sụa, Sie, Suo, Sụọ

    Shie.

    Tie, Tụa

    Vue, Vua, Vọọ

    Wue, Wụa, Wọọ

    Yie

    Zua, Zụa, Zie

    Chia, Chua, Chụa, Chaa, Chee Gwọọ, Gwue

    Kwa, Kwaa, Kwua, Kwụa, Kwue

    Nwee, Nwua, Nwue.

    Nya, Nyua, Nyue, Nyia.

    NJIKỌTA ŅKPỤRỤ-OKWU ANỌ:

    Bara, Bere, Biri, Boro, Bọrọ, Buru, Bụrụ.

    Dara, Dere, Diri, Dịrị, Doro, Dọrọ, Duru, Dụrụ.

    Fara, Fere, Firi, Fịrị, Foro, Fọrọ, Furu, Fụrụ.

    Gaba, Gara, Gawa, Gere, Giri, Gịrị, Gini, Gịnị, Goro,

    Gọrọ, Guru, Gụrụ.

    Ghara, Ghere, Ghiri, Ghịrị, Ghoro, Ghọgbu(ghọbu),

    Ghọrọ, Ghọta, Ghọwa, Ghuru, Ghuta, Ghụrụ,

    Ghucha, Ghuwa.

    Hara, Here, Hiri, Hịrị, Horo, Họrọ, Huru, Hụrụ.

    Jara, Jere, Jiri, Jịrị, Joro, Jọrọ, juru, jọrọ.

    Kara, Kere, Kiri, Kịrị, Koro, Kọrọ, Kuru, Kụrụ.

    Lara, Lere, Liri, Lịrị, Loro, Lọrọ, Luru, Lụrụ.

    Mara, Mere, Miri, Mịrị, Moro, Mọrọ, Muru, Mụrụ.

    Nara, Nere, Niri, Nịrị, Noro, Nọrọ, Nuru, Nụrụ.

    Ñara, Ñere, Ñiri, Ñịrị, Ñoro, Ñọrọ, Ñuru, Ñụrụ.

    Para, Pere, Piri, Pịrị, Poro, Pọrọ, Puru, Pụrụ.

    Kpara, Kpere, Kpiri, Kpịrị, Kporo, Kpọrọ, Kpuru,

    Kpụrụ.

    Rara, Rere, Riri, Rịrị, Roro, Rọrọ, Ruru, Rụrụ.

    Sara, Sere, Siri, Sịrị, Soro, Sọrọ, Suru, Sụrụ.

    Shara, Shere, Shiri, Shịrị, Shoro, Shọrọ, Shuru,

    Shụrụ.

    Tara, Tere, Tiri, Tịrị, Toro, Tọrọ, Turu, Tụrụ. Teta,

    Tewa, Titụ, Tiwa.

    Vara, Vere, Viri, Vịrị, Voro, Vọrọ, Vuru, Vụrụ. Vula,

    Vuta, Vuwa, Vuga.

    Wara, Were, Wiri, Wịrị, Woro, Wọrọ, Wuru, Wụrụ,

    Wucha, Wupu, Wuwa, Wutu.

    Yara, Yere, Yiri, Yịrị, Yoro, Yọrọ, Yuru, Yụrụ.

    Zara, Zere, Ziri, Zịrị, Zoro, Zọrọ, Zuru, Zụrụ.

    Chara, Chere, Chiri, Chịrị, Choro, Chọrọ, Churu,

    Chụrụ.

    Gwara, Gwere, Gwiri, Gwịrị, Gworo, Gwọrọ, Gwuru,

    Gwụrụ.

    Kwara, Kwere, Kwiri, Kwịrị, Kworo, Kwọrọ, Kwuru,

    Kwụrụ.

    Nwara, Nwere, Nwiri, Nwịrị, Nworo, Nwọrọ, Nwuru,

    Nwụrụ.

    Nyara, Nyere, Nyiri, Nyịrị, Nyoro, Nyọrọ, Nyuru,

    Nyụrụ.

    AHA-OKWU MA-OBỤ OKWU-NA-AHA YA:

    Okwu-na-aha-ya na-egosi aha mmadụ, aha ihe, ma-ọbụ aha ebe ihe mere. Dika ihe ima-atụ, okwu ndia bụ aha:

    Ēkē……nkea bụ aha ahia.

    Élé.....nkea bụ aha anụmanụ.

    Mbara-ama……aha nkea na-egosi ebe ndi-mmadụ na-agbakọ, bụrụkwa ebe ụmụ-ntakiri na-enwe mgwuri egwu.

    Maazi Ejiọfọ…..Aha nkea na-egosi nwoke nke bụ dimkpa na dike.

    Ọzọkwa, Maazi Ejiọfọ bụ aha mmadụ. Eke, Nkwọ, Orie na Afọ bụ aha di iche iche nke ahia nwere.

    Ajụ-ala na Éké bụ aha ụmụ anụmanụ nke ji afọ ha eje-ije. Aha ha ọzọ bụ agwọ.

    Ọzọ-di-mgba…...nkea bụ aha anụmanụ nke bi nime ọhia.

    Ọzọọ……Aha nkea na-egosi nwoke nke chiri echichi.

    Ényί…..Nkea bụ aha anụmanụ nke buru oke ibu ri nne.

    Ényī…..Mgbe mmadụ abụa ma-ọbụ atọ bụ ndi-ọyi, ha na-ahụkọ onwe ha nạ’anya. Omume di otua bụ inwe- enyi. Ndi-enyi nwere-ike bụrụ ụmụ-nwoke abụa, ma- ọbụ otu nwoke na otu nwanyi, ma-ọbụ ụmụ-nwanyi abụa.

    N’obodo ndi-ọcha, nwoke na nwanyi na-esite n’ime ọyi banye n’ọlụlụ di-na-nwunye. Ma, n’ala- Igbo, omume di otua bụ irapụ omenala meewa omenelu.

    Ọlụlụ di-na-nwunye, n’ala Igbo, na-amalite n’ọlụ ana-akpọ: ichụ-nta nwanyi. Nkea bụ dika omenala ndi-Igbo si di.

    IJE-OKWU MA-ỌBỤ OKWU-NA-IJE YA:

    Okwu-na-ije ya bụ okwu na-egosi ka ihe si eme. Okwu-na-ije ya ụfọdụ bụ ndia: Gaa, Jee, Kọọ, Kwue, Zụa, Wue.

    Gaa ụlọ-akwụkwọ.

    Jee ahia zụtara m akwụkwọ-nri.

    Kwue okwu bara uru.

    Kọọ akụkọ ife di ụtọ.

    Lụọ ọlụ ubi nke ọma.

    Zụa ụmụ gi nke ọma. Zaa ajụjụ ahụ ugbua.

    Wue ụlọ-elu n’ezi-na-ụlọ gi. Saa efere ahụ ọsọ ọsọ.

    Lụa nwunye nke aka gi.

    Mụa akwụkwọ gi n’ụlọ-akwụkwọ. Gbue agwọ di n’okpuru osisi.

    Jụa Onye-nkuzi ajụjụ kwesiri ekwesi. Ñụa mmiri.

    Rie nri.

    Bụa abụ.

    Saa aka gi tutu irie nri.

    Gụa akwụkwọ gi nke ọma. Nye ndi-okenye nsọpụrụ. Kpee ekpere tutu irara ụra.

    Nye Chineke ekele n’ụbọchi niile.

    Saa arụ gi n’ụtụtụ na n’oge abali.

    Jụ iza ajụjụ di nzuzu.

    Were akọ-na-uche gi lụa ọlụ bara uru.

    NDE-AHA: NDE-AHA BỤ OKWU NA-EWERE OKWU-NA-AHA YA.

    NDE-AHA: Okwu ndia bụkwa okwu na-ewere ọnọdụ nke okwu-na-aha nwere, n’ogologo asụsụ. Dika ihe ima-atụ, okwu ndi na-ewere ọnọdụ okwu- na-aha bụ okwu ndia.

    Mụ; mụ onwe m.

    Ya; ya onwe ya.

    Gi; gi onwe gi.

    Ha; ha onwe ha.

    Ọbụ; ọbụ ya.

    Ka anyi were okwu ndia sụa asụsụ:

    Asụsụ: Maazi Ọchiụzọ bụ Onye-eze.

    Enjoying the preview?
    Page 1 of 1